Ndị Rom 9:25
Romans 9:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya, “Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m. Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”*
Romans 9:25 in English
Romans 9:25 · Berean Standard Bible
As He says in Hosea: “I will call them ‘My People’ who are not My people, and I will call her ‘My Beloved’ who is not My beloved,”*
Context
23Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a. 24Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ? 25Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya,
“Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m.
Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”* 26Ma,
“Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha,
‘Unu abụghị ndị m,’
bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ* nke Chineke dị ndụ. ’ ”* 27Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel,
“Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri,
maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.