Ndị Rom 9:24
Romans 9:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ?
Romans 9:24 in English
Romans 9:24 · Berean Standard Bible
including us, whom He has called not only from the Jews, but also from the Gentiles?
Context
22Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi? 23Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a. 24Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ? 25Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya,
“Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m.
Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”* 26Ma,
“Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha,
‘Unu abụghị ndị m,’
bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ* nke Chineke dị ndụ. ’ ”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.