Ndị Rom 9:27
Romans 9:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel, “Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri, maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta.
Romans 9:27 in English
Romans 9:27 · Berean Standard Bible
Isaiah cries out concerning Israel: “Though the number of the Israelites is like the sand of the sea, only the remnant will be saved.
Context
25Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya,
“Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m.
Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”* 26Ma,
“Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha,
‘Unu abụghị ndị m,’
bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ* nke Chineke dị ndụ. ’ ”* 27Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel,
“Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri,
maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta. 28Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe.
Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.”* 29Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ,
“Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
ahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ,
anyị gara adị ka Sọdọm,
anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.