Native Bible

Romans 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụ ha jupụtara nʼokwu na-akụ ilu na ọbụbụ ọnụ.*

Romans 3:14 in English

Romans 3:14 · Berean Standard Bible

“Their mouths are full of cursing and bitterness.”*

Context

12Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile, ọ dịghị onye bara uru nʼime ha. Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma, a pụghị ịchọta ọ bụladị otu onye.* 13Akpịrị ha bụ ili ghere oghe, ha ji ire ha na-aghọ aghụghọ.* Elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha.* 14Ọnụ ha jupụtara nʼokwu na-akụ ilu na ọbụbụ ọnụ.* 15Ụkwụ ha na-eme ọsịịsọ ịkwafu ọbara. 16Mbibi na nhụju anya dị nʼụzọ ha niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.