Ndị Rom 11:8
Romans 11:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka e dere ya, “Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe; o mere nke a ruo taa.”*
Romans 11:8 in English
Romans 11:8 · Berean Standard Bible
as it is written: “God gave them a spirit of stupor, eyes that could not see, and ears that could not hear, to this very day.”*
Context
6Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu. 7Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha. 8Dịka e dere ya,
“Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe.
O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ,
nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe;
o mere nke a ruo taa.”* 9Devid kwukwara,
“Ka tebul ha ghọọrọ ha igbudu na ọnya,
ha bụrụkwa ihe ịsọ ngọngọ na ntaramahụhụ nye ha. 10Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ.
Mee ka azụ ha bụrụ ihe arọjiri arọji ruo mgbe ebighị ebi.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.