Ndị Rom 11:6
Romans 11:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu.
Romans 11:6 in English
Romans 11:6 · Berean Standard Bible
And if it is by grace, then it is no longer by works. Otherwise, grace would no longer be grace.*
Context
4Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? “E nwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nʼanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal.”* 5Otu a ka ọ dịkwa nʼoge dị ugbu a, a họrọla mmadụ ole na ole site nʼamara ya. 6Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu. 7Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha. 8Dịka e dere ya,
“Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe.
O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ,
nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe;
o mere nke a ruo taa.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.