Ndị Rom 11:7
Romans 11:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha.
Romans 11:7 in English
Romans 11:7 · Berean Standard Bible
What then? What Israel was seeking, it failed to obtain, but the elect did. The others were hardened,
Context
5Otu a ka ọ dịkwa nʼoge dị ugbu a, a họrọla mmadụ ole na ole site nʼamara ya. 6Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu. 7Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha. 8Dịka e dere ya,
“Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe.
O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ,
nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe;
o mere nke a ruo taa.”* 9Devid kwukwara,
“Ka tebul ha ghọọrọ ha igbudu na ọnya,
ha bụrụkwa ihe ịsọ ngọngọ na ntaramahụhụ nye ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.