Native Bible

Revelation 9:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agịrị isi ha dịka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze ha dịkwa ka eze ọdụm.

Revelation 9:8 in English

Revelation 9:8 · Berean Standard Bible

They had hair like that of women, and teeth like those of lions.

Context

6Nʼime ụbọchị ndị ahụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nʼebe ha nọ wezuga onwe ya. 7Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka ịnyịnya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. 8Agịrị isi ha dịka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze ha dịkwa ka eze ọdụm. 9Ha yikwasịrị onwe ha ihe ikpuchi obi dịka nke e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka ụda nzọ ụkwụ ọtụtụ ịnyịnya nke ụgbọ agha na-esekpu na-abanye nʼọgbọ agha. 10Ha nwere ọdụdụ dịka akpị. Ma ike niile e nyere ha bụ imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise site nʼike dị nʼọdụdụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.