Mkpughe 9:7
Revelation 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka ịnyịnya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ.
Revelation 9:7 in English
Revelation 9:7 · Berean Standard Bible
And the locusts looked like horses prepared for battle, with something like crowns of gold on their heads, and faces like the faces of men.
Context
5Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị a, kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Mmekpa ahụ ha dịka ahụ ụfụ na nhụju anya nke akpị mgbe ọ gbara mmadụ. 6Nʼime ụbọchị ndị ahụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nʼebe ha nọ wezuga onwe ya. 7Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka ịnyịnya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. 8Agịrị isi ha dịka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze ha dịkwa ka eze ọdụm. 9Ha yikwasịrị onwe ha ihe ikpuchi obi dịka nke e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka ụda nzọ ụkwụ ọtụtụ ịnyịnya nke ụgbọ agha na-esekpu na-abanye nʼọgbọ agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.