Native Bible

Revelation 9:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha yikwasịrị onwe ha ihe ikpuchi obi dịka nke e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka ụda nzọ ụkwụ ọtụtụ ịnyịnya nke ụgbọ agha na-esekpu na-abanye nʼọgbọ agha.

Revelation 9:9 in English

Revelation 9:9 · Berean Standard Bible

They also had thoraxes like breastplates of iron, and the sound of their wings was like the roar of many horses and chariots rushing into battle.

Context

7Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka ịnyịnya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. 8Agịrị isi ha dịka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze ha dịkwa ka eze ọdụm. 9Ha yikwasịrị onwe ha ihe ikpuchi obi dịka nke e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka ụda nzọ ụkwụ ọtụtụ ịnyịnya nke ụgbọ agha na-esekpu na-abanye nʼọgbọ agha. 10Ha nwere ọdụdụ dịka akpị. Ma ike niile e nyere ha bụ imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise site nʼike dị nʼọdụdụ ha. 11Ha nwere mmụọ ozi nke Abis,* onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.