Mkpughe 7:10
Revelation 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị, “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.”
Revelation 7:10 in English
Revelation 7:10 · Berean Standard Bible
And they cried out in a loud voice: “Salvation to our God, who sits on the throne, and to the Lamb!”
Context
8E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). 9Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha. 10Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị,
“Nzọpụta dịrị Chineke anyị,
onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ,
dịkwara Nwa atụrụ ahụ.” 11Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe, 12na-asị,
“Amen!
Ngọzị niile na otuto niile,
na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile
na ike niile na ume niile,
dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.
Amen.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.