Native Bible

Revelation 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Revelation 7:8 in English

Revelation 7:8 · Berean Standard Bible

from the tribe of Zebulun 12,000, from the tribe of Joseph 12,000, and from the tribe of Benjamin 12,000.

Context

6E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). E sitere nʼebo Manase* họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). 7Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). 8E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). 9Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha. 10Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị, “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.