Abụ Ọma 94
Psalms 94 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ,
o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị. 2Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa;
kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha. 3Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe?
Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ? 4Ha na-ekwuwapụ okwu mpako;
ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ. 5Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị;
ha na-emegbu ihe nketa gị. 6Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa;
ha na-egbu ndị na-enweghị nna. 7Ha na-asị, “Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a;
Chineke Jekọb na-agba nkịtị.” 8Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m;
unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe? 9Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe?
Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ? 10Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ?
Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma? 11Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ;
ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi. 12Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị,
onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị; 13ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu;
tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu. 14Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya;
ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ. 15Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile;
ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya. 16Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume?
Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe? 17A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka,
agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ. 18Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,”
ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m. 19Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m,
nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ. 20A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ,
nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya? 21Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume
na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ. 22Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m,
na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ. 23Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha,
lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha;
Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.