Native Bible

Psalms 94:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.

Psalms 94:17 in English

Psalms 94:17 · Berean Standard Bible

Unless the LORD had been my helper, I would soon have dwelt in the abode of silence.

Context

15Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya. 16Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume? Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe? 17A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ. 18Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m. 19Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m, nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.