Native Bible

Psalms 94:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị;

Psalms 94:12 in English

Psalms 94:12 · Berean Standard Bible

Blessed is the man You discipline, O LORD, and teach from Your law,

Context

10Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ? Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma? 11Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ; ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi. 12Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị; 13ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu. 14Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya; ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.