Native Bible

Psalms 94:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ?

Psalms 94:3 in English

Psalms 94:3 · Berean Standard Bible

How long will the wicked, O LORD, how long will the wicked exult?

Context

1O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ, o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị. 2Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa; kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha. 3Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ? 4Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ. 5Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị; ha na-emegbu ihe nketa gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.