Native Bible

Psalms 91:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.”

Psalms 91:2 in English

Psalms 91:2 · Berean Standard Bible

I will say to the LORD, “You are my refuge and my fortress, my God, in whom I trust.”

Context

1Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile. 2Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.” 3Nʼezie, ọ ga-anapụta gị site nʼọnya nke onye osi ọnya na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi. 4Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị. Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ, ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.