Abụ Ọma 91:4
Psalms 91:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị. Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ, ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.
Psalms 91:4 in English
Psalms 91:4 · Berean Standard Bible
He will cover you with His feathers; under His wings you will find refuge; His faithfulness is a shield and rampart.
Context
2Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,
Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.” 3Nʼezie, ọ ga-anapụta gị
site nʼọnya nke onye osi ọnya
na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi. 4Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị.
Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ,
ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta. 5Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị,
maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie, 6maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị,
ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.