Native Bible

Psalms 91:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.*

Psalms 91:11 in English

Psalms 91:11 · Berean Standard Bible

For He will command His angels concerning you to guard you in all your ways.

Context

9Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị, ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m, 10mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị; ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso. 11Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.* 12Ha ga-eji ọbụ aka ha, bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume. 13Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ, zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.