Native Bible

Psalms 91:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị; ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.

Psalms 91:10 in English

Psalms 91:10 · Berean Standard Bible

no evil will befall you, no plague will approach your tent.

Context

8Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume. 9Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị, ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m, 10mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị; ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso. 11Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.* 12Ha ga-eji ọbụ aka ha, bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.