Abụ Ọma 91:8
Psalms 91:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume.
Psalms 91:8 in English
Psalms 91:8 · Berean Standard Bible
You will only see it with your eyes and witness the punishment of the wicked.
Context
6maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị,
ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie. 7Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị,
iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị,
ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso. 8Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ
ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume. 9Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị,
ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m, 10mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị;
ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.