Abụ Ọma 91:7
Psalms 91:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị, iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị, ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.
Psalms 91:7 in English
Psalms 91:7 · Berean Standard Bible
Though a thousand may fall at your side, and ten thousand at your right hand, no harm will come near you.
Context
5Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị,
maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie, 6maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị,
ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie. 7Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị,
iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị,
ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso. 8Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ
ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume. 9Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị,
ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.