Native Bible

Psalms 89:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị? Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile?

Psalms 89:6 in English

Psalms 89:6 · Berean Standard Bible

For who in the skies can compare with the LORD? Who among the heavenly beings * is like the LORD?

Context

4‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela 5O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ. 6Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị? Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile? 7Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu. 8O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.