Abụ Ọma 89:5
Psalms 89:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.
Psalms 89:5 in English
Psalms 89:5 · Berean Standard Bible
The heavens praise Your wonders, O LORD— Your faithfulness as well— in the assembly of the holy ones.
Context
3Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ.
Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, 4‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi
meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela 5O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile,
na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ. 6Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị?
Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile? 7Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu;
ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.