Abụ Ọma 89:18
Psalms 89:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị, eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel.
Psalms 89:18 in English
Psalms 89:18 · Berean Standard Bible
Surely our shield belongs to the LORD, and our king to the Holy One of Israel.
Context
16Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile;
ha na-aṅụrị nʼezi omume gị. 17Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha,
site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu. 18Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị,
eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel. 19I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ,
nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị:
“Enyela m otu onye dị ike agha ike;
Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m. 20Achọtala m Devid ohu m,
were mmanụ nsọ m tee ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.