Native Bible

Psalms 78:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha;

Psalms 78:42 in English

Psalms 78:42 · Berean Standard Bible

They did not remember His power *— the day He redeemed them from the adversary,

Context

40Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu. 41Mgbe mgbe, ha nwara Chineke; ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe. 42Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha; 43nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt, ọrụ ebube ya niile nʼọhịa Zoan. 44O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara. Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.