Abụ Ọma 78:40
Psalms 78:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
Psalms 78:40 in English
Psalms 78:40 · Berean Standard Bible
How often they disobeyed Him in the wilderness and grieved Him in the desert!
Context
38Ma o meere ha ebere.
Ọ gbaghara ha mmehie ha.
Ọ laghị ha nʼiyi.
Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya.
Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya. 39Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke,
chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị. 40Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara;
ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu. 41Mgbe mgbe, ha nwara Chineke;
ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe. 42Ha echetaghị ike ya,
ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.