Abụ Ọma 78:39
Psalms 78:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke, chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.
Psalms 78:39 in English
Psalms 78:39 · Berean Standard Bible
He remembered that they were but flesh, a passing breeze that does not return.
Context
37Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya.
Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya. 38Ma o meere ha ebere.
Ọ gbaghara ha mmehie ha.
Ọ laghị ha nʼiyi.
Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya.
Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya. 39Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke,
chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị. 40Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara;
ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu. 41Mgbe mgbe, ha nwara Chineke;
ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.