Native Bible

Psalms 78:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya.

Psalms 78:37 in English

Psalms 78:37 · Berean Standard Bible

Their hearts were disloyal to Him, and they were unfaithful to His covenant.

Context

35Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta. 36Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha. 37Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya. 38Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya. 39Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke, chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.