Abụ Ọma 78:37
Psalms 78:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya.
Psalms 78:37 in English
Psalms 78:37 · Berean Standard Bible
Their hearts were disloyal to Him, and they were unfaithful to His covenant.
Context
35Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha,
na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta. 36Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe,
were ire ha na-aghara ya ụgha. 37Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya.
Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya. 38Ma o meere ha ebere.
Ọ gbaghara ha mmehie ha.
Ọ laghị ha nʼiyi.
Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya.
Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya. 39Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke,
chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.