Native Bible

Psalms 78:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha.

Psalms 78:36 in English

Psalms 78:36 · Berean Standard Bible

But they deceived Him with their mouths, and lied to Him with their tongues.

Context

34Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya; ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike. 35Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta. 36Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha. 37Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya. 38Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.