Abụ Ọma 74:14
Psalms 74:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan, mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
Psalms 74:14 in English
Psalms 74:14 · Berean Standard Bible
You crushed the heads of Leviathan; You fed him to the creatures of the desert.
Context
12Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie.
Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa. 13Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ.
Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri. 14Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan,
mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara. 15Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ.
I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa. 16Ehihie na abalị bụ nke gị.
I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.