Native Bible

Psalms 68:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ka unu nwee ike saa ụkwụ unu nʼime ọbara ndị iro unu, ka ire nkịta unu niile ketakwa oke nke ha.”

Psalms 68:23 in English

Psalms 68:23 · Berean Standard Bible

that your foot may be dipped in the blood of your foes— the tongues of your dogs in the same.”

Context

21Nʼezie, Chineke ga-egwepịa isi ndị iro ya niile, isi ndị niile na-aga nʼihu ibi ndụ mmehie. 22Onyenwe anyị kwuru sị, “Aga m esite na Bashan kpọlata ha, aga m adọpụta ha site nʼebe omimi nke osimiri, 23ka unu nwee ike saa ụkwụ unu nʼime ọbara ndị iro unu, ka ire nkịta unu niile ketakwa oke nke ha.” 24O Chineke, ahụla igwe ahịrị mmadụ ndị na-eso gị, bụ igwe ahịrị mmadụ nke so Chineke m, na Eze m na-aba nʼebe nsọ ahụ. 25Ndị na-abụ abụ nọ nʼihu, ndị na-eti egwu, na-eso ha nʼazụ; ụmụ agbọghọ na-akpọ ụbọ sokwa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.