Abụ Ọma 66:5
Psalms 66:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!
Psalms 66:5 in English
Psalms 66:5 · Berean Standard Bible
Come and see the works of God; how awesome are His deeds toward mankind.
Context
3Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu!
Ike gị dị nnọọ ukwu,
ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ. 4Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị;
ha na-abụku gị abụ otuto,
ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela 5Bịa lee ihe Chineke mere,
ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ! 6O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ,*
ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee*;
bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya. 7Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya,
anya ya na-elekwa mba niile,
ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.