Native Bible

Psalms 66:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!

Psalms 66:5 in English

Psalms 66:5 · Berean Standard Bible

Come and see the works of God; how awesome are His deeds toward mankind.

Context

3Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ. 4Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela 5Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ! 6O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ,* ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee*; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya. 7Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.