Native Bible

Psalms 66:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.

Psalms 66:3 in English

Psalms 66:3 · Berean Standard Bible

Say to God, “How awesome are Your deeds! So great is Your power that Your enemies cower before You.

Context

1Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke! 2Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube! 3Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ. 4Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela 5Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.