Abụ Ọma 55:6
Psalms 55:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru! Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.
Psalms 55:6 in English
Psalms 55:6 · Berean Standard Bible
I said, “Oh, that I had wings like a dove! I would fly away and find rest.
Context
4Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m;
oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m. 5Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m;
oke egwu ekpuchiela m. 6Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru!
Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike. 7Agaara m efelaga ebe dị anya,
ga nọrọ nʼọzara; Sela 8Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m,
ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.