Abụ Ọma 55:4
Psalms 55:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m; oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m.
Psalms 55:4 in English
Psalms 55:4 · Berean Standard Bible
My heart murmurs within me, and the terrors of death assail me.
Context
2ṅaa m ntị, zaakwa m.
Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude 3nʼihi ihe onye iro m na-ekwu,
nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ,
nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ,
na-akpagbu m nʼiwe ha. 4Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m;
oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m. 5Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m;
oke egwu ekpuchiela m. 6Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru!
Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.