Abụ Ọma 55:3
Psalms 55:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nʼihi ihe onye iro m na-ekwu, nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ, na-akpagbu m nʼiwe ha.
Psalms 55:3 in English
Psalms 55:3 · Berean Standard Bible
at the voice of the enemy, at the pressure of the wicked. For they release disaster upon me and revile me in their anger.
Context
1O Chineke, nụrụ ekpere m,
agbakwala arịrịọ m nkịtị; 2ṅaa m ntị, zaakwa m.
Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude 3nʼihi ihe onye iro m na-ekwu,
nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ,
nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ,
na-akpagbu m nʼiwe ha. 4Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m;
oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m. 5Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m;
oke egwu ekpuchiela m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.