Native Bible

Psalms 55:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m; oke egwu ekpuchiela m.

Psalms 55:5 in English

Psalms 55:5 · Berean Standard Bible

Fear and trembling grip me, and horror has overwhelmed me.

Context

3nʼihi ihe onye iro m na-ekwu, nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ, na-akpagbu m nʼiwe ha. 4Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m; oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m. 5Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m; oke egwu ekpuchiela m. 6Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru! Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike. 7Agaara m efelaga ebe dị anya, ga nọrọ nʼọzara; Sela

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.