Native Bible

Psalms 54:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume.

Psalms 54:4 in English

Psalms 54:4 · Berean Standard Bible

Surely God is my helper; the Lord is the sustainer of my soul.

Context

2O Chineke, nụrụ ekpere m; gee ntị nʼokwu ọnụ m. 3Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela 4Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; onyenwe m bụ onye na-agba m ume. 5Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi. 6Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.