Abụ Ọma 54:3
Psalms 54:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela
Psalms 54:3 in English
Psalms 54:3 · Berean Standard Bible
For strangers rise up against me, and ruthless men seek my life— men with no regard for God. Selah
Context
1O Chineke, jiri aha gị zọpụta m;
jirikwa ike gị kpepụta m. 2O Chineke, nụrụ ekpere m;
gee ntị nʼokwu ọnụ m. 3Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha;
ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m,
ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela 4Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m;
onyenwe m bụ onye na-agba m ume. 5Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m;
nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.