Abụ Ọma 48:8
Psalms 48:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka anyị nụrụ, otu a ka anyị hụrụ, nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nʼime obodo Chineke anyị: Chineke na-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Sela
Psalms 48:8 in English
Psalms 48:8 · Berean Standard Bible
As we have heard, so we have seen in the city of the LORD of Hosts, in the city of our God: God will establish her forever. Selah
Context
6Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ,
ihe mgbu ha dịka nke nwanyị na-achọ ịmụ nwa. 7Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ
si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi. 8Dịka anyị nụrụ,
otu a ka anyị hụrụ,
nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
nʼime obodo Chineke anyị:
Chineke na-eme ka o guzosie ike
ruo mgbe ebighị ebi. Sela 9O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị,
ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ. 10O Chineke, dịka aha gị,
otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile;
aka nri gị jupụtara nʼezi omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.