Native Bible

Psalms 47:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.*

Psalms 47:6 in English

Psalms 47:6 · Berean Standard Bible

Sing praises to God, sing praises; sing praises to our King, sing praises!

Context

4Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị, ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela 5Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo. 6Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.* 7Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya. 8Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.