Native Bible

Psalms 44:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala; ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ.

Psalms 44:9 in English

Psalms 44:9 · Berean Standard Bible

But You have rejected and humbled us; You no longer go forth with our armies.

Context

7ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ, ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị. 8Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile, anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela 9Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala; ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ. 10I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga, i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị. 11Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ, ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.