Abụ Ọma 44:17
Psalms 44:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị, ma anyị echefubeghị gị. Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị.
Psalms 44:17 in English
Psalms 44:17 · Berean Standard Bible
All this has come upon us, though we have not forgotten You or betrayed Your covenant.
Context
15Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu,
ihere m na-ekpuchikwa m ihu, 16mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị,
nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ. 17Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị,
ma anyị echefubeghị gị.
Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị. 18Obi anyị ahapụbeghị gị!
Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị. 19Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị,
jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.