Abụ Ọma 39:10
Psalms 39:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kwụsị iti m ihe; ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ.
Psalms 39:10 in English
Psalms 39:10 · Berean Standard Bible
Remove Your scourge from me; I am perishing by the force of Your hand.
Context
8Zọpụta m site na mmehie m niile;
ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu. 9Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu,
nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a. 10Kwụsị iti m ihe;
ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ. 11Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha;
ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla,
mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. Sela 12“O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m,
gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka;
emechila ntị gị nye ibe akwa m.
Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa,
dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.