Abụ Ọma 39:8
Psalms 39:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Zọpụta m site na mmehie m niile; ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu.
Psalms 39:8 in English
Psalms 39:8 · Berean Standard Bible
Deliver me from all my transgressions; do not make me the reproach of fools.
Context
6“Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo
nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ,
na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ. 7“Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya?
Olileanya m dị nʼime gị. 8Zọpụta m site na mmehie m niile;
ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu. 9Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu,
nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a. 10Kwụsị iti m ihe;
ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.