Abụ Ọma 37:12
Psalms 37:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha;
Psalms 37:12 in English
Psalms 37:12 · Berean Standard Bible
The wicked scheme against the righteous and gnash their teeth at them,
Context
10Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga;
ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha. 11Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha,
ha ga-enwekwa udo dị ukwuu. 12Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume,
na-ata ikekere eze megide ha; 13ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị,
nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa. 14Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha,
kwee ụta ha
ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa,
igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.