Abụ Ọma 36:4
Psalms 36:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe; ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume, ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.
Psalms 36:4 in English
Psalms 36:4 · Berean Standard Bible
Even on his bed he plots wickedness; he sets himself on a path that is not good; he fails to reject evil.
Context
2Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha,
na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị. 3Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ;
ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma. 4Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe;
ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume,
ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi. 5O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe,
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe. 6Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu,
ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri.
O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.