Abụ Ọma 36
Psalms 36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke
banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe:*
Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke
dị nʼanya ha. 2Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha,
na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị. 3Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ;
ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma. 4Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe;
ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume,
ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi. 5O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe,
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe. 6Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu,
ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri.
O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ. 7Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke!
Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ. 8Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị;
Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị. 9Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị;
ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè. 10Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị,
ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi. 11Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi,
ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo. 12Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala,
a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.
36:1 Maọbụ, Ozi si nʼaka Chineke: Mmebi iwu nke ndị ajọ omume bi nʼime obi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.