Native Bible

Psalms 36:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.

Psalms 36:9 in English

Psalms 36:9 · Berean Standard Bible

For with You is the fountain of life; in Your light we see light.

Context

7Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke! Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ. 8Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị; Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị. 9Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè. 10Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị, ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi. 11Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi, ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.